Igbo Proverbs, Idioms & Phrases

Blossom Ozurumba

A 2-minute podcast that you can quickly and easily listen to that will ideally share one Igbo Language Proverb, Idiom, or Phrase, provide the literal meaning and the figurative explanation while suggesting the most applicable English language equivalent. read less
ArtsArts

Episodes

E ree oké ọkpa nọ n'ógbè, agbataobi amara na itete ụra bu ọrụ
Aug 20 2022
E ree oké ọkpa nọ n'ógbè, agbataobi amara na itete ụra bu ọrụ
Date: August 15, 2022Podcast Title: E ree oké ọkpa nọ n'ógbè, agbataobi amara na itete ụra bu ọrụSeason 01|Episode 04Episode title and number: IPIP S01E04 Summary of episode:Igbo bụ Igbo, mma mma nụ!. N’ụbọchi nke taa n'Igbo Proverbs, Idioms and Phrases, anyị ga-ekwu maka inwe obi ekele. Ọ bụ ihe ọṅụ na ndi mmadụ kwupụtara ma gosipụta ka obi dị ha nyegara ndi mmadụ ibe ya karịsịa mgbe ha nọ n’etiti anyi. Ndụ adighi adigide. Biko, kelee ma kwanyere ndị mmadụ ugwu, maka echi di ime, onweghi onye ma ihe ọ ga amụ.Host: Mụ nwa, Blossom Ozurumba, na-anabata gị dịka oge niile. Ngwa, were ilu nke ga abara gi uru...Igbo: E ree oké ọkpa nọ n'ógbè, agbataobi amara na itete ụra bu ọrụ.Literal Translation: Na ikọwa ya n'okwu bekee, nke a pụtara, “When the neighborhood rooster is sold in the market square, the entire neighbours will finally know that it takes some effort to wake up daily, on time.”English Language Equivalent: Ngwa were otu ọmụmatụ odidi ya na asụsụ bekee, “You never know what you have until you lose it, and once you lose it, you would never get it back”.Sponsor:Cheta n’ọbụ ndi otu Igbo Wikimedians User Group wetere unu ya bụ Igbo proverbs, idioms and phrases. Biko gaa na www.wikimediaigbo.org ka ikpọtụrụ ha ma kelee ha maka nkwado ha.Call to Action: Maka ihe ndi ọzọ gbasara usoro nke Igbo proverbs, idioms and phrases, biko gaa na www.igbopip.com ka imara ha n'uju. Ndewo ndi ọma pụrụ iche.
E gbuo dike n'ọgụ ụlọ, ụbọchị ọgụ ezi bịara, a chọwa dike
Aug 1 2022
E gbuo dike n'ọgụ ụlọ, ụbọchị ọgụ ezi bịara, a chọwa dike
Date: August 08, 2022Podcast Title: E gbuo dike n'ọgụ ụlọ, ụbọchị ọgụ ezi bịara, a chọwa dike | Season 01|Episode 03Episode title and number: IPIP S01E03Summary of episode:Igbo bụ Igbo, mma mma nụ!. N’ụbọchi nke taa n'Igbo Proverbs, Idioms and Phrases, anyị ga-ekwu maka ichebe ihe gbasara gi karịsịa ebe ezinaụlo gi di. Ọ di mma ka ichebe ha n'uju ma kwalite mgbaghara mgbe ha mejọrọ gi. Maka na ọ buru na i weta ndị ara nke gi ka e gbuo ha, mgbe oge ara ruru, i gaghi-enwe onye ara ọ bula fọduru ichebe gi n'aka ndi-ara wetere gi ara-ha.Host: Mụ, Blossom Ozurumba, na-anabata gị dịka oge niile. Ngwa, were ilu nke ụbọchi taa...Igbo: E gbuo dike n'ọgụ ụlọ, ụbọchị ọgụ ezi bịara, a chọwa dike.Literal Translation: Na ikọwa ya n'okwu bekee, nke a pụtara, “If you kill a warrior during skirmishes at home, you will remember the warrior when war and fighting comes.”English Language Equivalent: Ngwa were otu ọmụmatụ odidi ya na asụsụ bekee, “blood is thicker than water.Sponsor:Cheta n’ọbụ ndi otu Igbo Wikimedians User Group wetere unu ya bụ Igbo proverbs, idioms and phrases. Biko gaa na www.wikimediaigbo.org ka ikpọtụrụ ha ma kelee ha maka nkwado ha. Call to Action: Maka ihe ndi ọzọ gbasara usoro nke Igbo proverbs, idioms and phrases, biko gaa na www.igbopip.com ka imara ha n'uju. Ndewo ndi ọma pụrụ iche.English Transcript:Greeting to the very distinguished Igbo people. Today on Igbo Proverbs, Idioms and Phrases, we will talk about about protecting your affairs especially where your family members are concerned. It is better to protect them fully and promote forgiveness when they wrong you. Because if you bring your own lunatics to be killed, when the time of madness comes, you will not have any lunatics left to protect you from the lunatics who brought you their madness.I, Blossom Ozurumba, welcomes you as always. Now, take today's proverb...Igbo: E gbuo dike n'ọgụ ụlọ, ụbọchị ọgụ ezi bịara, a chọwa dike.Literal Translation: If you kill a warrior during skirmishes at home, you will remember the warrior when when war and fighting comes.English Language Equivalent: Blood is thicker than water.Sponsor:Igbo proverbs, idioms and phrases is brought to you by the Igbo Wikimedians User Group. Please visit www.wikimediaigbo.org to contact them and thank them for their supportCall to Action: For more information on Igbo proverbs, idioms and phrases, please visit www.igbopip.com to know more. I celebrate you all.